Matthew 10:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chetakwanụ nke a! Onye ọ bụla kunyere otu nꞌime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nꞌihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, ga-anata ụgwọ ọrụ ya.”
Igbo 2006
Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi ntà ndia ṅua n'aha onye nēso uzọm, n'ezie asim unu, ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na onye ọbụla ekunye otu nʼime ndị a na-eso ụzọ m mmiri oyi ka ọ ṅụọ, nʼihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, nʼezie, asị m unu, ọ ghaghị ịnata ụgwọ ọrụ ya.”