Matthew 11:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jọn bịara nọọ nꞌetiti unu, o soghị unu rie nri, o sokwaghị unu ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Nꞌihi nke a unu sịrị na Jọn bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị.
Igbo 2006
N'ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jọn bịara na-erighị achịcha maọbụ ihe ọṅụṅụ. Ha sịrị, ‘Mmụọ ọjọọ bi nʼime ya.’