Matthew 11:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Nwa nke mmadụ bịara soro ndị mmadụ na-eri nri, na-anụkwa ihe ọṅụṅụ, ma gịnị ka unu na-ekwu banyere m? ‘Lee onye na-eri oke nri, na onye oke aṅụmaṅụ abịala!’ Unu na-akpọkwa m enyi ndị ọnaụtụ, na enyi ndị mmehie. Otu ọ dị, e sitela nꞌọrụ ọma a rụpụtara gosi na ụzọ ọ bụla Chineke si arụ ọrụ ya ziri ezi.”
Igbo 2006
Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n'onye ezi omume site n'ọlu-ya nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Nwa nke Mmadụ bịara na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ. Ha sị, ‘Lee, onye oke oriri na onye oke aṅụmaṅụ abịala, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie.’ Ma amamihe na-esite nʼọrụ ya gosiri na ihe o mere dị mma.”