Matthew 11:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ahụhụ dịrị gị obodo Korazin, ahụhụ dịkwara gị obodo Betsaida, nꞌihi na a si na ọ bụ nꞌime obodo Taịa na Saịdọn ka m rụrụ ọrụ ebube nile m rụrụ nꞌime unu, ha gaara echegharị gosi nchegharị ha site nꞌiyi uwe nkịkara, na ikpokwasị onwe ha ntụ nꞌisi.
Igbo 2006
Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga n'ákwà-nkpe na ntu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ahụhụ ga-adịrị gị Korazin. Ahụhụ ga-adịkwara gị Betsaida. Nʼihi na a sị na ọ bụ nʼime Taịa na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube niile a rụrụ nʼime unu, ha gaara echegharị ma gosikwa nchegharị ha site nʼiyi uwe mkpe na ikpokwasị onwe ha ntụ nʼisi.