Matthew 12:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Onye a bụ ohu m, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nꞌanya. Ọ bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye mmụọ m nꞌime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba nile aka.
Igbo 2006
Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara; Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma: M'gātukwasi Ya Mọ nkem, Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.