Matthew 12:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma ụfọdụ nꞌime ndị Farisịi hụrụ ha mgbe ha na-eme nke a, gwa Jisọs sị, “Lee ihe ndị na-eso ụzọ gị na-eme! Ha na-emebi iwu! Ha na-aghọ ọka nꞌụbọchị izuike!”
Igbo 2006
Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Lee, ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe na-ezighị ezi ime nʼụbọchị izuike!”