Matthew 12:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Mba ọ bụla ndị bi nꞌime ya na-alụrịta ọgụ enweghị ike ịdịgide ruo oge dị anya. Obodo ọ bụla, ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla e nwere nkewa na ịlụ ọgụ, nke ndị bi nꞌime ya na-egburita ibe ha, agaghị adịgide.
Igbo 2006
Ma ebe Ọ matara ihe di ha n'obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe ọ matara ihe ha na-eche nʼobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Alaeze ọbụla kewara megide onwe ya ga-ada. Obodo o bụla maọbụ ezinaụlọ ọbụla kewara megide onwe ya agaghị eguzo.