Matthew 12:32 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Onye ọ bụla kwuluru Nwa nke mmadụ ga-anata mgbaghara, ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara nꞌọgbọ a, ma ọ bụ nꞌọgbọ nke na-abịa.
Igbo 2006
Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n'oge a, ọ bughi kwa n'oge nke gaje ibia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa.