Matthew 12:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
A gwara anyị nꞌakwụkwọ nsọ na Devidi na ndị enyi ya banyere nꞌime ụlọ nsọ Chineke rie beredi dị nsọ e ji chụọra Chineke aja. Beredi nke nanị ndị nchụaja kwesịrị iri. Ma Devidi mebiri iwu site nꞌiri beredi ahụ, ya na ndị so ya.
Igbo 2006
otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu o si banye nʼụlọ Chineke, ya na ndị so ya, rie achịcha a na-eche nʼihu Chineke, nke na-ezighị ezi nʼiwu ka ha rie, kama ọ dịịrị naanị ndị nchụaja iri ya.