Matthew 12:40 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na dị ka Jona siri nọọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị, nꞌime afọ azụ, otu a ka Nwa nke mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nꞌime ala.
Igbo 2006
n'ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n'afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n'obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼafọ azụ dị ukwuu, otu a ka Nwa nke Mmadụ ga-esi nọọkwa ụbọchị atọ, ehihie na abalị nʼobi nke ala.