Matthew 12:41 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ndị Ninive ga-ebili kpee unu ikpe. Ha ga-amakwa unu ikpe. Nꞌihi na mgbe Jona gwara ha okwu Chineke, ha chegharịrị, tụgharịa, bịakwute Chineke, ma ugbu a onye karịrị Jona ukwuu nọ nꞌebe a ma unu achọghị ya.
Igbo 2006
Ndikom Nineve gēso ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ha gāma kwa ya ikpé: n'ihi na ha chèghariri na nkwusa nke Jona; ma le, Onye ka Jona nọ n'ebe a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ikom Ninive ga-eso ọgbọ a bilie nʼụbọchị ikpe maa ya ikpe. Nʼihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ nkwusa Jona. Ma lee onye karịrị Jona ukwuu nọ nʼebe a.