Matthew 13:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na obi ha gbara abụba, dịkwa rọ. Ha mechiri ntị ha, ka ha ghara ịnụ ihe. Ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ha mechiri obi ha, ka ha ghara ịghọta ma tụgharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ Ma a gọziri anya unu na ntị unu agọzi, nꞌihi na ha na-ahụ ụzọ, na-anụkwa ihe.
Igbo 2006
N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na obi ndị nke a a maala abụba, dịkwa arọ, ha adịghị ejikwa ntị ha anụ ihe, ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ma ọ bụghị otu a ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jirikwa ntị ha nụ ihe, sitekwa nʼobi ha nwe nghọta ma chigharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’