Matthew 13:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Ala ebe mkpụrụ ahụ dara nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ nke dara nꞌụzọ, nke ụmụ nnụnụ bịara tụrụ loo, nọchiri anya ndụ nụrụ eziokwu nke alaeze ahụ, ma ha aghọtaghị ya. Emesịa ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nꞌobi.
Igbo 2006
Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe onye ọbụla nụrụ oziọma nke alaeze ahụ, ma ọ ghọtaghị ya, ajọ onye ahụ na-abịa napụ ya ihe ahụ akụrụ nʼobi ya. Nke a bụ mkpụrụ ahụ nke dara nʼokporoụzọ.