Matthew 14:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nꞌụgbọ mmiri gaa nꞌọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma igwe mmadụ ndị si obodo dị iche iche nụrụ ya soro ya, kama ha si ụzọ elu ala jeruo ebe ọ nọ.
Igbo 2006
Ma mb͕e Jisus nuru ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya n'ub͕ọ, je iche rue ebe bu ọhia: mb͕e ìgwè madu nile nuru ya, ha we si n'obodo ahu nile so Ya n'ukwu ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala.