Matthew 14:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nꞌahịhịa. O weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu, rịọ Chineke ka ọ gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ.
Igbo 2006
O we gwa ìgwè madu nile ka ha nọdu n'elu ahihia; O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawaha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ob͕e achicha ahu, ndi nēso uzọ-Ya nēnye kwa ìgwè madu nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ.