Matthew 15:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, unu echegbula onwe unu, nꞌihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Mgbe ọ bụla kwa onye ìsì na-edu onye ìsì ibe ya ha abụọ aghaghị ịdaba nꞌime olulu.”
Igbo 2006
Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, unu echegbula onwe unu, nʼihi na ha bụ ndị ndu kpuru ìsì. Ma ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì ibe ya ha abụọ adaba nʼime olulu.”