Matthew 15:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Jisọs egheghị nwanyị ahụ ọnụ. Ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya rịọọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si esogharị anyị na-enye anyị nsogbu site nꞌarịrịọ ya!”
Igbo 2006
Ma Ọ zaghi ya okwu ọ bula. Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, nēkpere Ya, si, Zilaga ya; n'ihi na ọ nētiso ayi nkpu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ gbara ya nkịtị. Emesịa ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya rịọ ya sị ya, “Chụlaa nwanyị a! Lee ka o si eti mkpu na-esogharị anyị!”