Matthew 15:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ọrịa, na ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Jisọs gwọkwara ha nile.
Igbo 2006
Ọtutu ìgwè madu we biakute Ya, chiri ndi-ngwurọ, ndi-ìsì, ndi-ob͕i, ndi-ọlusi, na ọtutu ndi-ọria di iche, tiyere onwe-ha, ha we tọb͕ọ ha n'ala n'ukwu-Ya; O we me ka aru-ha di ike:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile.