Matthew 15:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌọmenala unu onye mere ihe dị otu a mere ihe ziri ezi, mgbe ọ jụrụ iji ihe o nwere sọpụrụ ndị mụrụ ya. Gịnị ka nke a na-egosi? Ọ̀ bụghị na unu emeela ka iwu Chineke bụrụ ihe dị ala karịa omenala unu?
Igbo 2006
ọ gaghi-asọpuru nna-ya ma-ọbu nne-ya ma-ọli. Unu nēme kwa okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu n'ihi ozizí enyere unu n'aka idebe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu.