Matthew 16:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Aga m enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe. Ihe ọ bụla dị nꞌụwa ị jụrụ na ọ gaghị abata nꞌeluigwe agaghị abata nꞌebe ahụ. Ihe ọ bụla kwa ị nabatara nꞌụwa, ya ka a ga-anabatakwa nꞌeluigwe.”
Igbo 2006
M'gēnye gi nkpisi-ugodi nke ala-eze elu-igwe: ihe ọ bula i gēke kwa ab͕u n'elu uwa, agēke ya n'elu-igwe: ihe ọ bula i gātọpu kwa ab͕u n'elu uwa, agātọpu ya n'elu-igwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”