Matthew 16:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Site nꞌoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere Jerusalem. O mere ka ha mata na ọ ga-ahụ ahụhụ dị iche iche site nꞌaka ndị isi ndị Juu. Ọ gwara ha sị, “Ndị isi ndị Juu ga-egbu m. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga m esite nꞌọnwụ bilie.”
Igbo 2006
Site na mb͕e ahu Jisus Kraist malitere igosi ndi nēso uzọ-Ya, na Ọ ghaghi ije Jerusalem, na ihu ọtutu ahuhu n'aka ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, na aghaghi ib͕u Ya, me kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubochi nke-atọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.