Matthew 16:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie na oji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nꞌihe ịrịba ama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nꞌime ya pụtara.
Igbo 2006
N'ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.