Matthew 17:25 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Pita zara ha sị, “Ee, ọ na-atụ ụtụ.” Ọ banyere nꞌụlọ ịgwa Jisọs banyere nke a. Ma tupuu Pita ekwuo ihe ọ bụla, Jisọs jụrụ ya ajụjụsị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Pita? Ọ̀ bụ nꞌaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ? Ọ̀ bụ nꞌaka ụmụ ha, ka ọ bụ nꞌaka ndị ọbịa e meriri emeri?”
Igbo 2006
Ọ si, E. Mb͕e ọ batara n'ulo, Jisus we buru uzọ gwa ya okwu, si, Gini bu uche-gi, Saimon? ndi-eze uwa, sìte n'aka ole ndi ka ha nānara ùtú-ahia ma-ọbu ùtú n'isi madu? n'àka umu-ha, ma-ọbu n'aka ndi-ọbìa?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?”