Matthew 17:27 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs sịrị, “Ọ dị mma, iwu ejighị ụmụ ha. Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nꞌosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nꞌime ya. Meghee ọnụ azụ nke mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nꞌime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”
Igbo 2006
Ma, ka ayi we ghara ime ka ha ma n'ọnyà, ga rue oké osimiri, tubà nko-azù, were azù nke buru uzọ puta; mb͕e i saghesiri ọnu-ya, i gāhu kwa otù shekel: were nke ahu, nye ha ka ọ buru nke Mu na gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”