Matthew 17:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Pita kpụ okwu a nꞌọnụ, igwe ojii kpuchiri ha nile. Ha nụrụ olu sitere nꞌigwe daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya! Ihe ya dịkwa m ezi mma. Nụrụnụ olu ya.”
Igbo 2006
Mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, le, igwe-oji nke nēnwu enwu kpuchiri ha: le kwa, olu si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma; nurunu okwu-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe ojii nke na-enwu enwu kpuchiri ha, olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma. Geenụ ya ntị.”