Matthew 18:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nꞌime ha akapfuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ̀ gaghị ahapụ iri atụrụ toolu na toolu fọdụrụ pụọ jegharịa nꞌugwu na ndịda nile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?
Igbo 2006
Gini bu uche-unu? ọ buru na onye ọ bula nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha hie uzọ, ọ̀ dighi-agha ọgu anọ na iri na iteghete ahu, ga ugwu, nāchọ nke ahu hiere uzọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na ọ dị onye nwere narị atụrụ, ma otu nʼime ha akpafuo, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu fọdụrụ pụọ jegharịa nʼugwu na ndịda niile, ịchọ atụrụ ahụ kpafuru akpafu?