Matthew 19:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ banyere ihe ziri ezi? Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye. Ọ bụrụ na ị chọrọ iketa alaeze eluigwe gaa debe iwu nile Chineke nyere.”
Igbo 2006
Ma Ọ siri ya, Gini mere i nājum ajuju bayere nke bu ezi ihe? Otù Onye di Nke bu ezi Onye: ma ọ buru na i nāchọ ibà nime ndu ahu, debe ihe nile enyere n'iwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji ajụ m ajụjụ banyere ihe bụ ezi ihe? Ọ dị naanị otu onye nke bụ ezi mmadụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịba nʼime ndụ ahụ, debe iwu niile e nyere.”