Matthew 19:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuru oke nꞌezie, laa nꞌụlọ gị ree ihe nile i nwere. Nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ na ụba nꞌeluigwe. Bịakwa soro m.”
Igbo 2006
Jisus siri ya, Ọ buru na i nāchọ ka i zue okè, laba, re ihe nile i nwere, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.”