Matthew 19:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara sị ya, “Mgbe mụ bụ nwa nke mmadụ ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze ebube m, nꞌalaeze ahụ, nꞌezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nꞌelu ocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ Izirel ikpe.
Igbo 2006
Jisus we si ha, N'ezie asim unu, na unu onwe-unu ndi sorom, n'imu-ọzọ ahu, mb͕e ọ bula Nwa nke madu gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya, unu onwe-unu gānọkwasi kwa n'oche-eze iri na abua, nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs zara sị ya, “Nʼezie agwa m unu, mgbe a ga-agbanwe ihe niile, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-anọkwasị nʼelu ocheeze ebube ya, nʼalaeze ahụ, nʼezie, unu bụ ndị na-eso ụzọ m ga-anọkwasị nʼocheeze iri na abụọ ahụ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.