Matthew 19:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
Igbo 2006
Ma asim unu, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko: onye nke gālu nwanyi ahu mb͕e arapuworo ya nākwa kwa iko.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”