Matthew 2:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha jeruru Betilehem, banye nꞌụlọ ebe nwantakịrị ahụ na nne ya nọ, daa nꞌala kpọọ isi ala nye nwa ọhụrụ ahụ. Ha meghere akpa ha nye ya onyinye ọlaedo, ọkpụrụkpụ eso osisi abụọ na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na maar.
Igbo 2006
Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá.