Matthew 2:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Chineke mere ka Josef hụ ya na nrọ. O nyere Josef iwu sị, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipti. Alọghachila tutuu ruo mgbe m ga-agwa gị, nꞌihi na Herọd na-achọ igbu nwantakịrị a.”
Igbo 2006
Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Onyenwe anyị mere ka Josef hụ ya na nrọ, ọ sịrị ya, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipt. Alọghachikwala tutu ruo mgbe m ga-agwa gị, nʼihi na Herọd na-achọ nwantakịrị a ka o gbuo ya.”