Matthew 2:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ha nọ nꞌụzọ, Josef nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd bụ nwa ya a na-akpọ Akelus. Nke a mere ụjọ ji tụọ Josef ịlaghachi Betilehem. Ma na nrọ ọzọ, Chineke dọrọ ya aka na ntị ka ọ hapụ ịlaghachi Judia, kama ka ọ laa Galili.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ nuru na Akeleọs bu eze Judia n'ọnọdu nna-ya Herod, ọ turu egwu ije ebe ahu; ma ebe Chineke duru ya ọdú na nrọ, o wezugara onwe-ya ga n'akuku Galili,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili.