Matthew 2:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Herọd kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu jụọ ha sị, “Ebee ka ndị amụma kwuru na a ga-anọ mụọ Onye nzọpụta ahụ?”
Igbo 2006
O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ.