Matthew 2:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Herọd gwasịrị ha okwu ndị a, ndị amamihe ahụ pụrụ. Nꞌezi, ha hụrụ kpakpando ahụ ọzọ, nke ha buru ụzọ hụ, ka o guzo na mbara eluigwe obodo Betilehem.
Igbo 2006
Mb͕e ha nuru okwu eze ahu, ha we ga; ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n'Ọwuwa-anyanwu, ọ nāga n'iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n'elu ebe Nwatakiri ahu nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ.