Matthew 20:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
‘Ndị a rụrụ ọrọ nanị otu awa, ma ị kwụrụ ha ụgwọ dị ka anyị bụ ndị rụrụ ọrụ site nꞌụtụtụ ruo anyasị.’
Igbo 2006
si, Ndi-ikpe-azu a luru otù hour, i we me ka ayi na ha ra, ayi ndi būru ibu arọ́ nke ubọchi ta, ya na ifufe di ọku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’