Matthew 20:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Nna nwe ụlọ zara otu nꞌime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọ bụla. Ọ̀ bụghị gị kwere na ị ga-arụ ọrụ ụbọchị taa nile? Ọ̀ bụghị gị kwekwaara na ị ga-anara naịra abụọ?
Igbo 2006
Ma ọ zara otù onye nime ha, si, Eyìm, emejọghm i: mù na gi enweghi otù olu ka m'nye gi otù shilling?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị?