Matthew 20:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara sị ya, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ ka m meere unu.” O chigharịrị lee Jemes na Jọn anya, jụọ ha ajụjụ sị, “Ùnu pụrụ ịṅụ site nꞌiko a dị oke egwu nke m ga-aṅụ?” Ha zara sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.”
Igbo 2006
Ma Jisus zara, si, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem gaje iṅu? Ha si Ya, Ayi puru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Jisọs zara sị, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Unu pụrụ ịṅụ iko ahụ nke mụ onwe m ga-aṅụ?” Ha zara ya sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.”