Matthew 21:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs banyere nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem malite ịchụpụ ndị nile na-ere ahia na ndị na-azụ ihe ahia nꞌebe ahụ. O kpuru tebulu ndị na-agbanwe ego ihu nꞌala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru.
Igbo 2006
Jisus we ba n'ulo uku Chineke, chupu ndi nile nēre nāzu kwa n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs banyere nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem, malite ịchụpụ ndị niile na-ere ahịa na ndị na-azụ ahịa nʼime ụlọnsọ ahụ. O kpuru tebul ndị na-agbanwe ego ihu nʼala, kwatuokwa oche ndị na-ere nduru.