Matthew 21:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịba ama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Otuto dịrị Nwa Devidi!” Iwe were ha nke ukwuu.
Igbo 2006
Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ huru ọlu-ebube nile Ọ luru, na umuaka ndi nēti nkpu n'ulo uku Chineke, si, Hosanna diri Nwa Devid; iwe were ha nke-uku,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu hụrụ ihe ịrịbama ndị a, hụkwa ka ụmụnta na-eti mkpu nʼoke olu nʼogige ụlọnsọ ahụ, na-asị, “Hozanna dịrị Nwa Devid.” Iwe were ha nke ukwuu.