Matthew 21:16 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ha bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ị̀ na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “Ee, ana m anụ ya. Ọ̀ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka e kwuru sị, ‘A ga-esite nꞌọnụ ụmụ a mụrụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara nye Chineke otutu dị ebube.’ ”
Igbo 2006
ha si Ya, Ì nānu okwu umuntakiri ndia nēkwu? Jisus we si ha, E: Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru, I si n'ọnu umu ọhu na umu nāṅu ara me ka ọjija zue okè?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha sịrị ya, “Ị na-anụkwa ihe ụmụnta ndị a na-ekwu?” Jisọs zara sị ha, “E, ana m anụ ya. Ọ bụ na unu agụtabeghị ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “ ‘I sitere nʼọnụ ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara gị, Onyenwe anyị, kwadooro otuto gị’?”