Matthew 21:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma o lepụrụ anya hụ otu osisi a na-akpọ fiigi ka ọ dị nꞌakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere ebe osisi ahụ dị, o jeruru nso nꞌukwu ya ịchọpụta ma ọ mịrị mkpụrụ. Ma ihe ọ hụrụ bụ nanị ahihia ndụ. Mkpụrụ ọ bụla adịghị nꞌelu ya. Ya mere, Jisọs bụrụ osisi ahụ ọnụ sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ huru otù osisi fig n'uzọ, Ọ biarue ya aru, ma Ọ hughi ihe ọ bula n'elu ya, ma-ọbughi nání akwukwọ ndu; O we si ya, Ka nkpuru ghara iputa n'elu gi ọzọ ebighi-ebi. Osisi fig ahu we kpọnwua n'otù mb͕e ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.