Matthew 21:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ gwara mmadụ abụọ a sị, “Meenụ ngwangwa baa nꞌime obodo ahụ dị anyị nꞌihu. Nꞌebe ahụ unu ga-ahụ otu inyinya ibu nke ya na nwa ya nọ nꞌotu ebe. Tọpụta inyinya ibu ahụ kpụta ya nꞌebe a.
Igbo 2006
si ha, Ganu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu, ngwa ngwa unu gāhu inyinya-ibu elibeworo, ya na nwa-inyinya-ibu: tọpunu ha, sekputaram ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha.