Matthew 21:26 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na ọ bụ mmadụ zitere ya, igwe mmadụ ndị a ga-abịakwasị anyị nꞌiwe, nꞌihi na mmadụ nile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.”
Igbo 2006
Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ayi nātu egwu ìgwè madu a; n'ihi na madu nile nāgu Jọn dika onye-amuma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.”