Matthew 21:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ugbu a geekwanụ ntị nꞌilu ọzọ. Otu nwoke dị nke nwere ala ubi. Nwoke a kụrụ osisi oroma nꞌubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, wuokwa mbadamba ebe a ga-anọ mee mmanya nꞌime ya. O wukwara ụlọ nche nꞌime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nꞌaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa biri nꞌala ọzọ.
Igbo 2006
Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ.