Matthew 21:38 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ma mgbe ndị a na-elekọta ubi ahụ lepụrụ anya hụ ọkpara nwoke a ka ọ na-abịa, ha gbara izu nꞌetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye ga-eketa ihe nile onyenwe ubi a nwere. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ubi a bụrụkwa nke anyị.’
Igbo 2006
Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’