Matthew 21:41 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ndị nọ nꞌebe ahụ zara sị ya, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nꞌiyi nꞌụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi ya tinye nꞌaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nꞌoge ya.”
Igbo 2006
Ha si ya, Ọ gāla ndi ọjọ ahu n'iyì n'uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi ọzọ, ndi gēnyeghachi ya nkpuru-ya n'oge-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.”