Matthew 21:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị, “Ọ̀ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, ka e mere ka ọ bụrụ nkume dị mkpa nꞌụlọ ahụ? Nke a bụ ọrụ nke nanị Onyenwe anyị rụrụ. Ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nꞌanya anyị!’
Igbo 2006
Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’