Matthew 21:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụfọdụ nꞌime igwe mmadụ ahụ nọ Jisọs nꞌihu, ndị ọzọ sokwa ya nꞌazụ. Ha nile nọkwa na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị, “Otuto dịrị Nwa Devidi! Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị! Otuto nꞌebe kachasị ihe nile elu!”
Igbo 2006
Ìgwè madu nile ndi nāga n'iru Ya, ndi nēso kwa, nēti nkpu, si, Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi; Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”