Matthew 22:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ nwoke a eriri, aka na ụkwụ, wepụkwanụ ya, gaa tụnye ya nꞌime ọchịchịrị, ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze.
Igbo 2006
Mb͕e ahu eze ahu siri ndi nējere ya ozi, Kenu ya ukwu na aka, tupu ya n'ọchichiri nke èzí; n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Eze ahụ nyere ndị ozi ya iwu sị ha, ‘Keenụ ya eriri, aka na ụkwụ, tụpụkwanụ ya nʼezi, nʼime ọchịchịrị, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’